MMETA NKE ỌMA N’ỤTỌASỤSU N’ULE SEKỌNDỊRỊ: NTỤLE ULE ỤMỤ AKWỤKWỌ ASỤMABỤỌ NA ZOONU MMỤTA NSỤKA DỊ NA STEETI ENUGWU

0
539

ISI NKE MB

MKPỌLITE

Ntọala Nchọcha

Asụsụ bụ ihe mmadụ zuru oke na mmadụ nwere ike iji wee mebe okwu maọbụ jiri ya dee ihe. O nweghị ihe e kere eke nwere ike iji asụsụ mebe okwu maọbụ jiri ya dee ihe ma ọ bụghị mmadụ. Asụsụ bụ ihe jikọtara okwu, echiche maọbụ onyonyo dị mmadụ n’echiche nke na-eme ka mmadụ nwee ike ikwupụta echiche ya maọbụ ikọwa ihe mmadụ kwuru.

Na mgbaso ụkwụ Mgbodile (1999) asụsụ n’usoro mmụta edukeshọn bụ ịghọta ihe asụsụ bụ na uru ọ bara  na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Iji kwado ihe o kwuru,  ọ bụ eziokwu maka na e wezuga asụsụ, o nweghị uru ọ bara mmadụ na mmad  ụ ibe ya imekọta. Dịka Brooks si rụtụ aka n’akwụkwọ Azikiwe (1998), asụsụ bụ ihe a na-amụ n’usoro kwesiri ekwesi dịka omenala ndị siri dị n’ụdị ọ siri gbasata mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Naldman, 1971 gbasokwara ihe Brooks kwuru n’akwụkwọ Huxley na Ingram, 1989 mgbe ọ sịrị, asụsụ bụ mkpọkọba okwu n’usoro echiche mmadụ siri dị nke ndị mmadụ ga-esi na ya gbado ụkwụ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.

Asụsụ dịka Fendinand de Saussure 1995 na akwụkwọ Hartzeler 1965 bụ nkwekọrịta ndị mmadụ kwekọrịtara n’obodo, nke ga-enye aka ịgbasa usoro iwu mmekọrịta mmadụ na ibe ya ndị kwere n’otu omenala.

 Maka mkpa ọ dị n’ịsụ asụsụ, o kwesịrị ka nwa afọ Igbo mara asụ asụsụ Igbo nke ọma ma makwara ede ya ede n’amaghị jijiji maọbụ mee nkụja ọbụla. O nweghị nwa afọ Igbo nwere ike ịsụ asụsụ Igbo nke ọma n’etinyeghị ya Bekee. Nke kachasị mwute bụ na ha enweghị ike ide asụsụ ha nke ọma. Ụfọdu nne na nna ekweghị ka e jiri Igbo na-akụziri ụmụ ha ihe nke ụmụ  ha ji asụ Igbo n’ụlọ maọbụ n’ụlọ akwukwọ. Ndị mmụta akwụkwọ tiri iwu si na bido n’akwụkwọ ọtaakara ruo na klaasị nke atọ ka a ga-eji asụsụ epum kụziere ha ihe ma asụsụ Bekee ga-abịa mgbe ọ bụ Bekee. Mana nke a abụghị maka ụmụ afọ Igbo.

Ihe ndị a bụ ihe na-ebụtere ụmụ akwụkwọ na asụ Igbo emeghị nke ọma n’ule Igbo ha n’ule nzere mmụta ‘West African Senior School Certificate Examination’ na ‘National Examination Council’. Nkọwa ndị ‘chief examiners’ (2008) na ‘West African Senior School Certificate Examination’ na-gosi na ụmụ akwụkwọ anaghị etinye uche n’asụsụ Igbo maka na ha were ya na o nweghị ebe e ji asụsụ Igbo aga, na asụsụ Bekee bụ ebe a nọ. Ha kọwakwara na ike kwa, na ndị nkụzi ji Bekee na-akụzi asụsụ Igbo mere na ụmụ akwụkwọ enweghị ike ịgụcha ihe a sịrị ha gụọ tupu ule akwụkwọ.

O wee na-agbagoju onye nchọcha anya maọbụ na asụsụ ụmụaka a na-asụ n’ụlọ abụghị nke e ji akụziri ha ihé n’ụlọ akwụkwọ ka ọ bụ na akwụkwọ e ji akụziri ha ihe adabaghị adaba n’usoro mmụta Igbo n’ụlọ akwụkwọ. Maka ihe a na-eme ka onye nchọcha ji wee gbado ụkwụ lebee anya n’ụtọasụsụ. Nwata akwụkwọ Igbo ga-ama ụtọasụsụ Igbo nke ọma, nke ga-enyere ya aka ide Igbo nke ọma. Onye nchọcha lebara anya na jenda, ibi n’ime obodo na ibi n’obodo mepere emepe nke na-enyekarị aka n’ịmata ụtọasụsụ.

Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ e wepụtara dịka asụsụ ala Naịjirịa a ga-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ọtaakara, sekọndịrị, kọleeji edukeshọn na mahadum (Ikekeọnwụ, 2007). Ọtụtụ atụmatụ ka gọọmenti etiti Naịjirịa sitegoro n’aka ngalaba ụlọ ọrụ ya na-ahụ maka mmụta nakwa site n’ụlọ ọrụ nkwalite ọmụmụ na nchọcha (NERDC) weputa iji mee ka a na akụzi asụsụ ndị a nke ọma. Oge ụfọdụ,  atụmatụ ọma ndị a na-ama afọ n’ala maọbụ nwee nsogbụ site n’enweghị ezigbo akwụkwọ, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ a ga-eji kụzie ma mụọkwa asụsụ ndị a.

Ebe ọzọ ọmụmụ asụsụ Igbo pụtara ihe bụ na West Indies. Ọ bụ Oldendrop, bụ onye bịara njem nchịkọta ihe ọ ga-eji mee ihe akụkọ mgbe ochie nọrụ nwee mmasị n’omenala, mmalite na asụsụ ndị ohu nọ ebe ahụ na-asụ. N’ihi nke a, nwoke a malitere lebawa anya n’ụdị asụsụ ndị ohu a na-asụ. N’afọ 1777 ka Oldendrop wepụtara akwụkwọ ya ọ kpọrọ Geschichte der Mission der Evangelischen Bruder auf den Carabischem. N’ime akwụkwọ ya, e nwere ụfọdụ mkpụrụ okwu Igbo, ọnụọgụgụ Igbo, Mkpọaha Igbo nke dị iri na atọ n’ọnụọgụgụ tinyekwara ahịrịokwu abụọ a tụgharịrị n’asụsụ Igbo. (Ụtazị Dave Okechukwu, 1998). Onye ọzọ deturu mkpụrụokwu Igbo bụ Olaudah Equianọ n’afọ 1789. Mkpụrụokwu Igbo a  o wepụtara dị iri asaa na itoolu. (Ọraka, 1983). N’afọ 1828, Ọrịakụ Hannah Kilham bụ onye nkụzị bipụtara akwụkwọ ọ kpọrọ Specimens of African Languages. Mkpọaha dị iri ise tinyekwara ọnụọgụgụ Igbo (Ọraka, 1983). Onye ọzọ chịkọbara okwu Igbo bụ MacGregor Laird n’afọ 1837. Mkpụrụokwu Igbo o kpokobara dị iri asaa. (Dave Okechukwu, 1998). Ka ọganihu mmepe ụfọdụ ka na-aga n’ihu n’asụsụ Igbo, otu nwoke a na-akpọ J.F. Schon Chịkọbara okwu Igbo dị puku iri ise n’ọnwa itoolu nke afọ 1840. (Ọraka, 1983). O rue n’afọ 1841, ọ chọrọ ijiri okwu Igbo nye nkọwa n’Igbo, ma Eze ndị Abọ kparịrị ya maka na ọ sụtaghị Igbo ya nke ọma. Nke a mere o jiri hapụ asụsụ Igbo wee lebe anya n’asụsụ nke ndị Awụsa (Nwadike, 2002). Onye nchọcha wee na-asị maọbụ ihe a merenu mere na ndị Igbo enweghị ike ịsụ asụsụ ha nke ọma dịka ndị Awụsa na Yoruba si asụ asụsụ ha ma ha nọkọọ ọnụ. Ihe mere na asụsụ Igbo enweghị ebe ọ gbadoro ukwu bụ na Rev. Metcalfe Sunter bịara ilebe anya ka mmụta sị aga na 1884 wee kwuo na asụsụ Igbo bụ asụsụ ndị iberibe na o nweghị uru ọ bara na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ma ọ bụrụ na a ga-akụzi Igbo, a ga-eji Bekee dee ya (Nwadike, 2002).

Mpụrụ okwu mbụ Igbo pụtaranụ bụ Nsibidi tupu ndị Bekee abịa ala anyị. Nsibidi bụ ederede e ji osise wee dee. Ịma atụ:

     di      na      nwunye.

Maxwell 1904 bụ onye mbụ Bekee mara maka nsibidi mgbe ọ bụ onye nlekọta ihe ọmụmụ na Calaba. O rue n’afọ 1905, o wepụta akara nsibidi dị iri abụọ na anọ n’ọnụọgụ (Ọraka, 1983). MacGregor 1909 gwara ụmụ akwụkwọ ya n’obodo Nịajirịa enweghị mkpụrụ okwu e ji ede ihe ma. Ma nwata akwụkwọ sịrị ya mba na e nwere mkpụrụokwu nke a na-akpọ nsibidi ma amatabeghị akụkụ obodo nsibidi bidoro (Ọraka, 1983). Nsibidi abụghị mkpụrụokwu e ji ede ihe ọ bụ ya butere o ji nwụọ n’oge maka n’ọbụ ihe ndị otu nzizo ji ekwu okwu. Ọ bụ ndị otu nzizo dịka ndị Odo, mmanwụ, ekpe na Ọkọnkọ ji ya akparịta ụka (Ọraka, 1983).

Chomsky 1957 n’akwụkwọ Agbedo (2000) kọwara na ụtọasụsụ bụ usoro e ji akpọpụta ahịrịokwu iji mara ma ahịrịokwu ahụ a kpọpụtara ma o so n’ụzọ ụtọasụsụ nke na ndị na-asụ asụsụ a ga-ama, ma asụsụ ahụ ọ dị mma, ma o so n’usoro. N’akụkụ nke ọzọ, Ọtagbụrụagụ, Obah, Onuigbo na Okorji (2007) kọwara na ụtọasụsụ bụ mma ahịrịokwu na-eso n’usoro e si ekwu okwu iji gosi ka okwu ahụ si adaba n’ahịrịokwu. Ụtọasụsụ bụ isi sekpu nti n’asụsụ ọbụla. Ọtụtụ ndị mmadụ kọwara ụtọasụsụ dịka  nghọta ha sị dị. Na nchịkọta ihe ndị mmadụ kọwara, ụtọasụsụ bụ ịma usoro e ji ya ekwu okwu maọbụ usoro e ji ya ede ihe. Ya bụ, usoro ụtọasụsụ kwesiri ịdị mfe n’ịghọta. Usoro okwu (sintaks) bụ nke na-eme ka okwu soro n’usoro ma nwee nghọta.

Ime ka nwata akwụkwọ sekọndịrị mata Igbo ọ na-asụ maọbụ o ji ede ihe, o kwesịrị ka nwata akwụkwọ ahụ mata nke ọma usoro ụtọasụsụ. Brooks na Oluikpe kwuru na akwụkwọ Ubahakwe (2004) sị na ụtọasụsụ dịịri asụsụ otu akụkụ ahụ mmadụ sị dịịrị mmadụ. Na nkọwa, onye ọbụla dị ndụ maọbụ onye nwụrụ anwụ nwere akụkụ ahụ. Otu a ka ọ dị n’asụsụ na ụtọasụsụ. Ihe a na-egosi n’ịma asụsụ Igbo maọbụ ide ya enweghị isi ma ọ bụrụ na nwata akwụkwọ amaghị ụtọasụsụ nke ọma. Maka na mgbaso usoro ide asụsụ na-agbodo ụkwụ n’ụtọasụsụ bụ isi nsekpu nti n’asụsụ ọ bụla. Balden 2003 kwuru  sị na onye nkụzi ọbụla na-akuzi asụsụ Igbo enweghị ike ịsụ maọbụ dee asụsụ Igbo nke ọma n’agbasoghị usoro ụtọasụsụ. Tupu nwata akwụkwọ ọbụla  asị   na ọ mara Igbo asụ maọbụ ede okwesịrị ịmata ụtọasụsụ nke ọma. Ọ bụrụ na ntụpọ adịghị n’odide Igbo, mara na Igbo a na-ede bụ ihe efu. Ya kpatara Oruchalu (1989) ji wee kwuo sị na ntụpọ dị mkpa n’Igbo na o nweghị ka a hapụ ya. A bịa n’ihe gbasara njụ, Igbo na Bekee na-adị iche. Ịma atụ:

 (1)      Hasn’t he eaten? Bekee azaa sị

            No, he hasn’t.

Ma Igbo ga-aza sị

Ee, o ribeghị

E lee anya, a ga-ahụ na mgbe ụfọdụ, ebe Bekee na-asị m@ba@, Igbo na-asị e$e@. Nke a kpatara na nwata akwụkwọ Igbo kwesịrị ịgbaso usoro ụtọasụsụ, mara ya nke ọma tupu ọ si na ya maara Igbo ede.

Ebe onye nchọcha gbadoro ụkwụ n’ụtọasụsụ bụ ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’, ‘kwa’ na-arụ n’ahịrịokwu. Ihe a na-ebute mgbagoju anya n’ịmụ, na ide Igbo nke ọma n’ebe ụmụ akwụkwọ kọleeji Igbo nọ. A bịa n’ọrụ ‘na’ na-arụ dịka  njiko, nnyemaka ngwaa, mbuụzọ, ọ na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu ịmata mgbe ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya maọbụ mgbe a ga-ewepụ ‘a’ dị na ‘na’. Mgbe ‘na’ na-ejiko okwu abụọ maọbụ karịa, ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya. Ima atụ;

2 (a)    Ji na ede bụ ihe oriri.

   (b)    Ada, Nneka na Ngọzị bụ enyi.

Ma mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka  mbuụzọ na-eso ụdaume, a ga-ewepu ‘a’ dị na ‘na’. Ịma atụ

3(a)     Nne nọ n’ụlọ

   (b)    Ha bi n’Aba

Ma mgbe ọ bụ na myiriụdaume ka ‘na’ na-eso ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya dịka  njiko. Ịma atụ;

4(a)     Azụ bi na mmiri.

  (b)     Anyị bi na Nsụka.

Mgbe ‘na’ na-arụ orụ dịka  nnyemaka ngwaa, a na-eji akara uhie ede ‘na’, na ngwaa ọ na-eso. Ịma atụ;

5(a)     Anyị na-amụ akwụkwọ.

  (b)     Nne na-aga ahịa.

Ihe ndị a na-ebutere ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul nsogbu mgbe a na-ewepu ‘a’ dị na ‘na’ na mgbe a na-ahapụ ya. Nsogbụ a na-eme ka ha ghara inweta akara nke ọma n’ule akwụkwọ siiniọ skuul safiriketi Egzamineshọn (SSCE). Ọ dị mkpa ịchọta onye maara n’Igbo nke ọma nke ga-enyere ụmụ akwụkwọ Igbo ịgbasa usoro ụtọasụsụ n’ide Igbo ọkachasị n’ebe ụdaume dị.

Nsogbu Nchọcha

              Ọtụtụ nsogbu dịịrị ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul n’okpuru ọchịchị mmụta Nsụka zoonu mere na ha anaghị emeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule nzere ‘West African Senior School Certificate Examination’. Nsogbu ndị a bụ na e bidoghị gboo kuzibere ha asụsụ Igbo bido n’akwụkwọ ọtaakara ruo na sekọndịrị. Ụfọdụ ndị nne na nna e kweghị ka e jiri asụsụ Igbo kuzibere ụmụ ha ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ọzọ dịka  ibe ya bụ na ha adịghị agbaziri ụmụ ha ka ha na-asụ Igbo n’ụlọ. Ndị nkụzi na-akụzi asụsụ Igbo abụghi ndi a zụrụ n’asụsụ Igbo. Maka ihi nke a, ha na-eji Bekee akụzi Igbo. Ụmụ akwụkwọ enweghị akwụkwọ ọgụgụ Igbo. Nke na-eme na onye nkụzi na-akụzi, ha e bụrụ n’isi na-aza ya. Ihe a na-eme na ha agaghị arụtali mkpụrụ okwu aka. Ọtụtụ oge ka a na-agbanwe akwụkwọ ọgụgụ Igbo nke na-enye ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ Igbo nsogbụ n’ọmụmụ Igbo. Ndị odee akwụkwọ Igbo na-enye ndị gọọmenti etiti aka azụ ka e were akwụkwọ ha kuzibe ihe n’eleghị anya ma ọ ga-agbanwe atụmatụ nkụzi n’afọ. Oge ụfọdụ akwụkwọ e dere adị iche na atụmatụ nkụzi. Nsogbo ọzọ bụ na ụmụ akwụkwọ chere na onye na-amụ asụsụ Igbo maọbụ asụ asụsụ Igbo bụ onye amaghị akwụkwọ. Maka ihi ya, ha enweghị mmasị n’asụsụ Igbo bụ epum ha.

            Ihe ndị a bụ ihe na-ebutere ụmụ akwụkwọ ndị sekọndịrị nsogbu emeghị nke ọma n’ụtọasụsụ asụsụ n’ule ‘West African Senior School Certificate Examination’. Nkọwa ndị ‘Chief Examiners’ na ‘West African Examination Council’ (2009) na-egosi na ụmụ akwụkwọ karịrị pesenti iri itoolu (90%) amaghị akwụkwọ ọgụgụ onye nkụzi sịrị ha gụọ tupu ule akwụkwọ. Ha chọpụtara na ndị nkụzi na-akụzi Igbo abụghị ndị a zụrụ azụ n’Igbo.

            Ihe ndị a bụ ihe onye nchọcha chọpụtara na-eme ụmụ akwụkwọ sekọndịrị emeghị nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule ‘West African Senior School Certificate Examination’.

Mbunuche Nchọcha

Mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule sekọndịrị;

Ntule ule ụmụ akwụkwọ asụmabụọ na zoonu mmụta Nsụka dị na Steti Enugu.

Mbunuche nchọcha edemede a bụ ịchọpụta:

(a)    Jenda ka eme nke ọma n’ule asụsụ Igbo.

(b)    Akụkụ asụsụ Igbo na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu.

(ch)  Akụkụ asụsụ Igbo ụmụ akwụkwọ ka eme nke ọma na ya.

(d)    Ndịiche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe n’ihe gbasara ụtọasụsụ.

(e)    Ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha ka ha si emedebe n’ụtọasụsụ.

Uru Nchọcha

            Ihe ọmụmụ a nyere aka n’ịhazi kọrịkulum. Ọ bụ ndị kọrịkulum a lebere anya ebe na-enye ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ nsogbu n’ọmụmụ ụtọasụsụ. Ọ bụ ndị kọrịkulum a wetara usoro ndị nkụzi ji akụziri ụmụ akwụkwọ ụtọasụsụ nke mere ka ụmụ akwụkwọ nwee mmasị n’ọmụmụ ụtọasụsụ. Ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ritere erere nke ukwu ma mgbe ha mere nke ọma n’ụtọasụsụ. Ọ bụ onye nkụzi bụ onye nọ ọnụdụ ịmata ebe ụmụ akwụkwọ n’enwe nsogbụ n’ụtọasụsụ. Ọ bụrụ na onye nkụzi amata ebe nsogbụ dị, o nyere ya aka ịma ụzọ o si a gbaziri ụmụ akwụkwọ ka ha ghọta ụtọasụsụ nke ọma. Ọ na-enyere ụmụ akwụkwọ aka ịma ka e si ede na ka e si agụ Igbo.

            Ihe onye nkụzi na ụmụ akwụkwọ matara nyere ndị na-ede akwụkwọ Igbo aka ịmata ebe ha gbadoro ụkwụ n’ide akwụkwọ Igbo ha. Ọ bụghịzị ka ihe a na-ede n’akwụkwọ dị iche site n’ihe onye nkụzi na-akuziri ụmụ akwụkwọ. N’ikpeazụ, ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ nwee mmasị n’ịgụ na ide Igbo nke ọma, o nye aka ibipụta akwụkwọ ọgụgụ Igbo ọkachasị n’ebe ụtọasụsụ dị bụ ebe a na-enwekarị nsogbu n’ihe gbasara ide Igbo.

Oke Nchọcha

            Ọmụmụ a gbadoro ụkwụ n’obodo mepere emepe na ime obodo nke dị n’okpuru ọchịchị mmụta zoonu Nsụka. E mere ka asụsụ Igbo soro n’asụsụ atọ na Naịjirịa a ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ụmụ akwụkwọ na-ele Igbo n’ule Senior School Certificate Examination (SSCE). N’agbanyeghị na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-asụ Bekee karịa asụsụ epum ha. Ebe ụlọ akwụkwọ sekọndịrị a dị, bụ ihe e lebere anya maka na ha bikọtara ọnụ. Ụmụ akwụkwọ nọ na gburugburu ahụ ji otu akwụkwọ amụ asụsụ Igbo.

            Ọmụmụ a gbadoro ụkwụ ịma ka ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul si gbadobe mgbọrọgwụ n’ihe gbasara ụtọasụsụ. Ọ na-eme ka a matakwa ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ na-enwe nsogbu karịa, nke ọzọ dịka  ibe ya bụ ima jenda ka emee nke ọma n’ụtọasụsụ na-arụtụkwa aka n’ebe ndị nọ n’ime obodo n’obodo mepere emepe si eme n’ụtọasụsụ.

Ajụjụ Nchọcha

            Ajụjụ nchọcha ndị a nyere maka ọmụmụ a;

(a)       Kedu ka ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha si emedebe nke ọma n’ụtọasụsụ?

(b)       Kedu ka jenda si emetuta mmeta nke ọma n’ule asụsụ Igbo?

(ch)     Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-enwe nsogbu?          

(d)       Kedu ndịmiche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe n’ihe gbasara ụtọasụsụ?

(e)       Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-eme nke ọma?

MMETA NKE ỌMA N’ỤTỌASỤSU N’ULE SEKỌNDỊRỊ: NTỤLE ULE ỤMỤ AKWỤKWỌ ASỤMABỤỌ NA ZOONU MMỤTA NSỤKA DỊ NA STEETI ENUGWU