NToALA oNYE NA NKA OGUGU IGBO KA O SI METUTA UMU AKWUKWO PRAIMARI NOKPURU OCHICHI NSUKA

0
524

ISI NKE MBỤ

OKWU MMALITE

Ntọala Nchọcha

          Ọgụgụ bụ otu n’ime nka onye na-amụ akwụkwọ kwesiri inweta n’ogo praịmarị. Nke a bụ ihe dị oke mkpa n’ebe ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị bụ nke ọ ga-ahụta onwe ya n’agụmakwụkwọ praịmarị ya niile. Ihe bụ oke ọrụ nke onye nkuzi bụ ime ka ụmụ akwụkwọ nwee ezi ntọala n’ebe ọgụgụ dị. Nka mmụta ọgụgụ dị mkpa niihi na ọ na-eweta ọganihu na ngalaba mmụta niile. Ọ kachasị mkpa maka na ọ na-akwalite ọgụgụ isi na nka mmụta nke mmadụ (Dechant, 1980). Onye nchọcha na-eche na o nwere ihe jikọtara ọgụgụ na echiche. Ọ na-eche echiche ma chemie ya nke ọma bụ onye ahụ nke na-agụ ihe ọgụgụ nke ọma kwa mgbe (Ogenyi, 2006).

          Ọgụgụ bụ nka. Dị ka nka ndị ọzọ, mmadụ ga-enweriri nka ọgụgụ ka o wee nwee ike isonye n’ụwa ọ nọ na ya. E nwere usoro dị iche iche onye nkuzi asụsụ na-agbaso iji wee kuziri ụmụ akwụkwọ nka ọgụgụ dị ka usoro Abịdịị, usoro Ahụ-Ekwue, Usoro Akụkọ na usoro Ncheta/Nkwagide.

N’usoro Abịdịị, onye nkuzi asụsụ na-akụziri ụmụ akwụkwọ etu e si agụpụta abịdịị site na – A B CH D. Ọ na-aka mma ibu ụzọ mụa abịdịị ndị nnukwu tupu abịdịị ndị obere.

          N’usoro Ahụ – Ekwue, onye nkuzi na-edepụta okwu ndị nwere mkpụrụedide atọ maọbụ anọ ka ụmụ akwụkwọ supee ma gụa. Iji maatụ: oke, aka, anya, akwa, akpa.

          N’usoro Akụkọ, ụmụ akwụkwọ na-amụ ọgụgụ site n’ịkọ akụkọ. Nke a na-eme n’ụzọ dị iche iche. O nwere ike ịbụ akụkọ n’ọnụ nwekwa ike bụrụ na tepu. Ụmụ akwụkwọ ga-akọ akụkọ a ugboro ugboro wee rue mgbe ha buru ya n’isi.

          N’usoro Ncheta/Nkwagide ụmụ akwụkwọ na amụ ọgụgụ site n’ige ntị na-ikwugarị ihe ha nụrụ, ụmụ akwụkwọ na-ege ntị n’ihe ọgụgụ kwa mgbe na-eto n’ịbụ ezigbo ndị ọgụụ.

Ndị ọrụ aka dị ka ndị ọkpụ blọkụ, ndị ọkpụ ụzụ, ndị kapịnta, ndị na-agbaihe ọkụ, ndị ọchụ nta, ndị nka na ndị ọrụ ugbo bụ ndị nwere ọrụ nka n’ụdị dị n’akụkụ nke ha. Site n’onyinye na nka ha nwere ka ha ji egbo mkpa. N’otu aka ahụ, onye nwere mmụta site n’ọgụgụ na-enwe ọnọdụ n’ebe ndị gụrụ akwụkwọ na ndị nwere nghọta nọ n’obodo.

N’usoro echiche a, ọgụụ anaghị agba mbọ ịghọta mbunuche odee. Ọtụtụ ihe bụ mbunuche e ji na-agụ ihe ọgụgụ. A na-agụ iji wee nwee ọgụgụ isi, ozi gbasara ihe, mmadụ maọbụ isiokwu. N’ogo praịmarị, mbunuche ime nchọcha na nghọta echiche ndị mmadụ na-abụ na klasị dị elu. Na klasị nta, ihe ha na-emekarị bụ ịmata mkpụrụ edide, ịgụpụta mkpụrụ okwu na ahịrịokwu. N’oge a na-ezu ike, a na-agụ ihe ọgụgụ iji wee nweta obi ụtọ.

 Ihe ndị a ka a na-eme iji nwee izu ike. Ịmụ ihe bụ ụzọ e si enweta ezi ọgụgụ. N’ọmụmụ ihe, a na-agụmi ma na-agụsi ihe ọgụgụ ike iji wee gafee n’ule akwụkwọ. Ịji ezigbo nkaọgụgụ na-eweta ọganihu n’ọmụmụ na nkuzi asụsụ. Dị ka Alo (2001) si wee kwuo, ọgụgụ bụ ngwa dị oke mkpa mmadụ ji amụ ma na-esonye n’akụnaụba ọgbara ọhụrụ. N’agbanyeghi nke a, ọgụgụ na-akwado mmadụ n’ọrụ nwadiala. Ọ na-eme nke a site n’inye ya ike ịnara na ịyọchapụta ihe ndị niile e deturu n’akwụkwọ iji wee nye aka chepkwaba ahịrị, ụda na njimara ndụ ọha obodo. Baldeh (1990) dere iji kwado ihe ndị ọkammụta ndị ọzọ kwuru gbasara ọgụgụ. N’arụmarụ ụka ya, ọ kọwara na ọgụgụ na odide na-enyere ụmụ mmadụ aka inweta ihe. Enyemaka a na-eweta mgbamume nke na-akwalite isonye n’ọchịchị onye kwuo uche ya n’obodo a haziri ahazi. Ndị ọka mmụta niile n’agbanyeghi ebe onye tozuru etozu kwekọrịtara na ọgụgụ bụ isi ntughe n’usoro agụmakwụkwọ (Mgbodile, 1991). Ọtụtụ na ndị ọkachamara n’usoro agụmakwụkwọ ebidwo na-eti mkpu n’ihe gbasara ọdịda n’agụmakwụkwọ dị n’obodo ọkachasị Naịjịrịa.

Ọtagburuagụ (2001) na-egosi na ebe e nwere ọtụtụ asụsụ dị ka Naịjịrịa, ịgụ akwụkwọ ụmụ akwụkwọ na-adabere karịa na mbọ ụlọ akwụkwọ. Ma ụlọ akwụkwọ enweghị ngwa ọrụ ha ga-eji wee mejupụta ihe ndị nne na nna n’ụlọ ebe ụmụ akwụkwọ si wee pụta tụrụ anya a n’aka ha, n’agbanyeghi na ụmụ akwụkwọ bịara n’aka ha ka ha nweta mmụta.

Ụfọdụ ntọala na-emetụta ọgụgụ ụmụ akwụkwọ na-esite n’inye ụmụ akwụkwọ ohere ọgụgụ site n’aka ndị nne na nna na ndị nkuzi nakwa usoro agụmakwụkwọ enwere bụ nke enweghi ike ịkpalite mmụọ ha n’inye ha nkwado. Ntọala akụnaụba nne na nna na ntọala agụmakwụkwụ ha na-enwe nnukwu mmetụta n’ ọgụgụ na mmụta akwụkwọ ha. Ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ a gụrụ akwụkwọ nwekwa ego na-agụ ọgụgụ nke ọma karịa ụmụ akwụkwọ sị n’ezinaụlọ agụghị akwụkwọ ma ha enweghi ego. Ndị gụrụ akwụkwọ na-azụtara ụmụ akwụkwọ ha akwụkwọ ya na-ngwa ọgụgụ ndị ọzọ bụ nke na-akpalite mmọọ ha ịmụ ka e si agụ mgbe ha ka dị obere. N’otu aka ahụ, nwata akwụkwọ si n’ezinaụlọ akụnaụba dị na-enwe ezigbo ngwa ọgụgụ na akwụkwọ nke na-eme ka o nwee ezigbo agwa na mmasị n’ ọgụgụ. N’otu aka ahụ, ụmụ ndị ọka mmụta, ndị nkụzi na ndị ọrụ bekee na-eme nke ọma n’ule karịa ụmụ ndị na-azụ ahịa na ndị ọrụ aka dị iche iche.

Ubahakwe (1973) kwuru na nka ọnụnụ ihe na okwukwu okwu ụmụ akwụkwọ na-adabe n’ahụmihe ha. Ọ na-ahịa ahụ ịghọta ọgụgụ ma ọ bụrụ na ahụmihe eyitaghị nghọta ọgụgụ. Iji maatụ, ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ si n’ime obodo a gụa akụkọ gbasara ndụ ndị nọ n’obodo mepere emepe, aghọtaazaa akụkọ ha ga-adị iche na nke ụmụ akwụkwọ nweelara nghọta ndụ ndị nọ n’obodo mepere emepe site n’ahụmihe. Ntọala ahụmimihe nwata akwụkwọ Naịjịrịa na-apụta ihe n’ụdị dị iche na nke si na ngwa ọmụmụ n’akwụkwọ egwuregwu ọ gụrụ.

Unoh (1968) depụtara ihe ndị a dị ka ihe dị mkpa n’asụsụ nwata akwụkwọ ga-amata ka o wee nwee ike meta nke ọma na òtu mkpụrụ okwu, ndọkọ ahịrịokwu, ngwaa, akara edide, na usoro mmebe okwu. O kwuru na naanị ma nwata akwụkwọ nwere ezigbo nghọta ihe ndị a niile, ọgụgụ edemede na mmekọrịta ya ga-ajọ njọ.

Itsuokor (1991) chọpụtara na gburugburu mmadụ nke nwere ike ịmetụta ọgụgụ aghọtaazaa na ngosi gụnyere ụdịrị ụlọ akwụkwọ nwata akwụkwọ gụrụ na ya, ụdịrị ndị nkụzi kụziiri ya, ntọala ezinaụlọ, mgbanwe ụlọ akwụkwọ maọbụ nkwụsị maka mkpatara dị iche iche. Ihe ndị a niile ga-emetụta nka agụmakwụkwọ nwata akwụkwọ, mmasị ọgụgụ n’emume ngosi nchemi echiche ya.

Okwor na Enyiobi (1986) kwuru na mgbado anya ndị nne na nna na-enye ụmụ ha na ụdị mgbado anya ha na-enye ha na-emetụta nka ngosi ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị nne na nna ga-enye ụmụ ha n’ọrụ skuul ha oge, nke a ga-arụ ọrụ dị ka ihe mkpalite mmụọ nke ga-eweta mgbakwunye na mmasị ọgụgụ n’emume ngosi nchemi echiche ụmụ ha. Ha gara n’ihu na-ekwu na mbọ ndị nne na nna na-emetuta emume ngosi ụmụaka n’asụsụ ha. Mgbe nne na nna enweghị ike ịnọrụ ala, nke a na-emetụta emume ngosi ụmụaka niihi na ụmụaka anaghị atụkwasi obi n’ihe ha na-amụ maka obere nlekwasa anya nke a na-enye ha. Ha gara n’ihu na-ekwu na ọbụrụ na ngwa nke na-eme ka nwata akwụkwọ na-aga n’ihu n’ọmụmụ adịghị, nwata ahụ agaghị enweta ọkpụrụkpụ ihe mgbakwasa ụkwụ. E nyeghi nwata akwụkwọ ọkpụrụkpụ ihe mkpalite mmụọ ga-eme ka ọ ghara ịmeta nke ọma.

Ma mgbe ụfọdụ, nke a anaghị adịcha ire n’aka ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ akụnaụba dị. Ahụmihe ndị ọmụmụ nkụzi nwetara n’ebe ngosipụta ihe ọmụmụ ha na-egosi na ụmụ akwụkwọ enweghi akwụkwọ na-ebu ụzọ eme ihe omume ọgụgụ ha karịa ndị nwere akwụkwọ. Ihe nlere anya a bụ ihe ịtụnanya niihi na ihe a na-ahụbu atụgharịzịa n’akụkụ nke a. Ike kwa, enweghi ngwa ọgụgụ bụ ihe na-akpalite mmụọ ụmụ akwụkwọ ndị a ịgụ mgbe ọbụla ha nwere ohere ibite akwụkwọ n’aka ụmụ akwụkwọ ibe ha maọbụ n’ọba akwụkwọ. E nwere ndị nne na nna agụghị akwụkwọ, ha enweghi ego ịzụta ezigbo ngwa ọgụgụ ma ha amakwaghi uru ngwa ọgụgụ bara. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ndị Naijịrịa sonyere na ndị dị etu a. Akwụkwọ ọgụgụ ha na-ahụ anya izizi bụ n’ụlọ akwụkwọ ndị praịmarị ebe akwụkwọ a ga-agụ na klaasị bụ naanị akwụkwọ ọgụgụ ha ga-enwe.

Ntọala ndị ọzọ nwere mmetụta na mbọ na ọgụgụ ụmụ akwụkwọ gụnyekwara agbụrụ na-eziputa ụdị omeme mmadụ site n’aka fere aka. Mgbe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-eñomi inwe isi akwụkwọ maọbụ enweghi isi akwụkwọ site n’aka ndị bu ha ụzọ n’ezinaụlọ. N’aka nke ọzọ, ịhụnanya na akpọmasị ụmụ akwụkwọ na ngwa ọgụgụ dị ka akwụkwọ ọgụgụ ha, usoro ọgụgụ na ndị nkuzi na-enwekwa mmetụta n’ ọgụgụ.

Echiche izugbe n’aka ndị nkwado mmụta na ndị ọha obodo bụ na ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị dara ada. Ihe a na-ahụ ụbọchi niile na-egosi na ọgụgụ kanọ n’agba mbụ n’obodo a bụ Naịjịrịa.

Mbunuche nchọcha nke ọha bụ ịchọpụta ntọala onye na nka ọgụgụ igbo: ka o si metuta ụmụ akwụkwọ praịmarị. Nchọcha a na-agbado ụkwụ n’ịchọpụta ma: ntọala akụnaụba ụmụ akwụkwọ o nwere mmetụta na nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị; etu nkwado ndị nne na nna si emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị; etu ntọala ọgụgụ akwụkwọ nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị; na etu inwe mmasị ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ ndị a gụrụ akwụkwọ si di iche na nke ndị si n’ezinaddụlọ agụghị akwụkwọ. Ndị klaasị nke ise ka a ga-eji mee nchọcha a niihi na a tụụ anya na ndị klaasị nke ise ga-agụta ihe ọgụgụ nke ọma.

Ọgụgụ bụ ngwa dị oke mkpa iji wee nweta nka dị iche iche na ihe mmadụ tosiri ịmata ka o wee tozuo na ndụ ya. Ọ bụ ihe dị oke mkpa na ụmụ akwụkwọ ga-enwe ezigo mmasị n’ịgụ akwụkwọ ma sikwa etu a kwalite usoro agụọazaa. Ọ bụ site n’ihe dị etu a ka e ji wee malite ọmụmụ a iji wee chọpụta ntọala ónyē na nka ọgụgụ Igbo, ka osi metuta ụmụ akwụkwọ ọkachasị ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ nke ogo praịmarị.

Nsogbu Nchọcha

Echiche izugbe n’aka ndị nkwado mmụta na ndị ọha obodo bụ na ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị dara ada. Ihe a na-ahụ ụbụchi niile na-egosi na ọgụgụ n’obodo a bụ Naịjịrịa kanọ n’agba mbụ. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ si n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ejighi ezigbo ntọala ọgụgụ banye sekọndịrị nke nta. Nke a na-egbochi ịghọta akwụkwọ ọgụgụ na ihe omume a na-enye ha. Ụdị ọnọdụ dị etu a na-ebute emeghi nke ọma n’ule ha ji apụta na praịmarị. Nwaogu (1973) na-egosi na e wezuga nka inwe ike ọgụgụ, mmadụ ga-abụ ogbi n’ụzọ nghọta, ịmata ihe, ahụmihe nke ndụ ma bụrụ onye nnọrọmele karịa isonye n’iketa oke n’amamihe nke ụwa.

Nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n’ọgụgụ na-esitekarị n’enweghị nghọta mpụtara mkpụrụ okwu. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-ewere nghọta ọbụla ha chepụtara nye okwu ha amaghị nghọta ya, ma site etu a, ha anaghị enwe nghọta ederede ha na-agụ. Naanị ma ụmụ akwụkwọ nwere nghọta mpụtara mkpụrụ okwu, ha agaghị enwe ike kọwaa mpụtara mkpụrụ okwu a na-ekwu maka ya.

Nsogbu nchọcha a wee bụrụ kedu ka ntọala onye si emetuta nka ọgụgụ Igbo nke ụmụ akwụkwọ praịmarị n’okpuru ọchịchị Nsụka n’Enugu Steeti.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu ntọala ónyē si-emetuta nka ọgụgụ Igbo: ka ntọala onye si metuta ụmụ akwụkwọ praịmarị niile dị na Nsụka. Nchọcha a na-agbado ụkwụ n’ịchọpụta:

  • Ma e34eeeeeeeeeeeeeeee       sssssedseeee““ee ntọala akụnaụba ụmụ akwụkwọ o nwere mmetụta na nka ọgụgụ nke ụmụ akwụkwọ praịmarị.
  • Etu nkwado ndị nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị
  • Etu ntọala ọgụgụ akwụkwọ nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị.
  • Etu inwe mmasị ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ ndị gụrụ akwụkwọ si di iche na nke ndị si n’ezi n’ụlọ agụghị akwụkwọ.

Uru Nchọcha

          Ndị dị iche iche ga-erite uru na nchọcha a bụ ndị a:

Ụmụ akwụkwọ, ndị nne na nna, ndị nkuzi, ndị nhazi mmụta na ndị odee.

Nchọcha a ga-eme ka ụmụ akwụkwọ nwee ezi mmasị n’ ọgụgụ. Ọ ga-enyekwara ndị nne na nna aka ịmata mkpa ọgụgụ dị na ndụ ụmụ ha na ịmata ihe a ga-eme ka ha na-enye ụmụ akwụkwọ ezigbo nkwado n’ ọgụgụ.

Site na nchọcha a, ndị nkuzi ga-enwe ike kwalite ezi mmasị na ọgụgụ n’ebe ụmụ akwụkwọ nọ ma si etu a kwalitekwa agụmakwụkwọ ha. N’ime nke a, ha ga-ewube ezigbo ọba akwụkwọ usoro ọgụgụ na ngwa ọmụmụ ihe n’ụlọ akwụkwọ. N’otu aka ahụ, akwụkwọ ụlọ akwụkwọ wepụtara a ga-agụ nwere ike ịbụ nke ga-akwalite mmasị ọgụgụ.

Ọ ga-eme ka ndị nhazi mmụta mata ihe na-eme na ụmụ akwụkwọ na-enwe mmasị maọbụ anaghị enwe mmasị n’ ọgụgụ. Nchọcha a ga-emekwa ka a mata ihe na-ebuta ụmụ akwụkwọ enweghị nghọta ihe ha gụrụ. Ịmata ihe ndị a ga-eme ka ndị nhazi akwụkwọ wepụta ngwa ga-akwalite mmasị ụmụ akwụkwọ ma meekwa ka ọgụgụ na-aga n’ihu.

Ndị ode akwụkwọ agụmagụ ga-enwetakwa uru n’ihe ọmụmụ a makana ka ha na-amata ebe mmasị ụmụ akwụkwọ dị n’ ọgụgụ ka ha ga-esite na nchọpụta  a wee nwee ike dee akwụkwọ maka ụmụ akwụkwọ ma ndị si na ntọala ebe a gụrụ akwụkwọ ma ndị si n’ebe a gụghị akwụkwọ.

Oke Nchọcha

Ebe a ga-anọ mee nchọcha a bụ na Nsụka dị n’Enugu Steeti nke Naịjịrịa. A ga-anọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị niile dị na Nsụka mee nchọcha a. Isiokwu oke nchọcha a ga-agbado ụkwụ n’ịmata ntọala onye na nka ọgụgụ Igbo: ka o si metuta ụmụ akwụkwọ praịmarị dị na Nsụka.

Ajụjụ Nchọcha

Ka e wee hazie usoro nchọcha a, e weputara ajụjụ nchọcha anọ. Ha bụ:

  • Olee etu ntọala akụnaụba ụmụ akwụkwọ si-emetụta nka ọgụgụ ha?
  • Kedu ka nkwado ndị nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ?
  • Olee etu ogo agụmakwụkwọ nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ?
  • Kedu ka inwe mmasị ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ ndị gụrụ akwụkwọ si dị iche na nke ndị si n’ezinaụlọ agụghị akwụkwọ.

Ụmaokwu

  1. Ọ dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ e nwere nnukwu akụnaụba na ndị si n’ezinaụlọ e nwere obere akụnaụba.
  2. Ọ dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ nwere nkwado ndị nne na nna na ndị e enweghị nkwado ndị nne na nna.
  3. Ọ dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ nne na nna ha gụrụ akwụkwọ na ndị nne na nna ha agụghị akwụkwọ.
  4. Ọ dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin mmasị ọgụgụ  ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ a gụrụ akwụkwọ na ndị si n’ezinaụlọ agụghị akwụkwọ.
NToALA oNYE NA NKA OGUGU IGBO KA O SI METUTA UMU AKWUKWO PRAIMARI NOKPURU OCHICHI NSUKA